Man United vs Chelsea: Ikuku ekuola a hụ otele Chelsea

Man United vs Chelsea: Ikuku ekuola a hụ otele Chelsea
Man United vs Chelsea: Ikuku ekuola a hụ otele Chelsea


Eke niile bụ eke mana e nwere eke nwe ọhịa.
Otu egwuregwu bọolụ Manchester United mere ka ndị Chelsea mata nke a oge ha jị ọkpụ goolu anọ chara acha nyụọ ha ịkpakwụ.

Watford anyụọla Chelsea ịkpakwụ
A gbaalara Chelsea ụgbọ nwamkpi
Chelsea etiela epele n'isi Brighton

Nke a bụ nzute mbụ Ole Gunnar Solksjaer na Frank Lampard na-ezute onwe ha dịka ndị nkụzi bọọlụ.

Nke a bụkwa asọmpị mbụ nke Lampard na-agba dịka onye nkụzi na 'English Premier League'.

Mana Solksjaer sịrị ya nnọo n'ụzọ pụrụ iche.
Agbanyeghi na Romelu Lukaku bụ onye onyee goolu ndị Man Utd apụọla, nsogbu ọbụla adịghịrị ha n'eguregwu nke taa.

Marcus Rashford nyere goolu nke mbụ site na penariti, mgbe Zuma gbaturu ya.

Anthony Martial mezuru ya abụọ n'agba nke abụọ, ebe Rashford nyekwara goolu ọzọ.

Daniel James, bụ onye Man Utd zụtara ọhụrụ, nyere goolu mbụ ya iji gosi na ọbịaghị ilegharị anya.

Harry Maguire na Aaron Wan Bissaka gosikwara ihe kpatara Man Utd ji zụọ ha oke ọnụ ahịa.

Ndị Chelsea nwekwara obere chi ọjọọ mgba Tammy Abraham nakwa Emmerson gbara ọtụnigwe n'agba nke mbụ.

Ụfọdụ ndị Chelsea ji eme ọnụ esokwaghị n'egwu nke taa n'ihi mmerụ ahụ.

Ndị a gunyere Antonio Rudiger, Willian, Reuben Loftus-Cheek, nakwa Callum Hudson-Odoi.

Ngolo Kante, onye etiti ndị Chelsea, batara na nkeji iri asaa na anọ.

Etu ihe si kwụrụ ugbua, Man Utd bụzị ndị nke abụọ na EPL ebe ndị mbụ bụ Manchester City.

Liverpool bụ ndị nke atọ ebe Brighton bụ ndị nke anọ. Mana nke a adịchaghị mkpa ugbua n'ihi na chi ka na-efo efo.

Source: BBC IGBO